Nchọcha a lebara anya n’ahịrị okwu ndị nwere mmafenye ma ọ bụ ngwakọ asụsụ Igbo na Bekee iji zipụta myiri usoro okwu asụsụ abụọ a na otu myiri ha si akwalite anaghịnwu asụ asụsụ Igbo ghara ịgwakọ ya na Bekee dịka e si ahụta ya n’ala Igbo taa. Usoro a gbasoro mee nchọcha a bụ nke nkọwasị, ma were atụtụ ewumewu ahịrị nnọrọ onwe (Matrix Language Frame) nke Myers-Scotton (1993) wepụtara nakwa atụtụ emereme nsinokwu (Speech Act Theory) nke Austin (1975) wubere nye ya nkọwasị bara uru. Njiatụle e ji mee nchọcha a bụ nke ndị nchọcha ji ndọrọ okwu dọrọ n’ogige egwuregwu na ebe mkpori ndụ; ha mekwara ka ndị sonyere mata ihe e ji ekwurunọnụ ha eme. Ha jiri nwayọọ họrọ ndị ga-aba uru nye nchọcha a. A chọpụtara na e nwere myiri dị na ndokọ asụsụ Igbo na asụsụ Bekee ọ kachasị n’ewumewu ahịrị mfe nke na-apụta n’ụdị ONN/ONM na SVO/SVC n’otu n’otu. N’asụsụ Igbo, nrụmaka naeso mkpọaha ndị ha na-akọwa n’azụ mana a bịa n’asụsụ Bekee, nrụmaka na-ebu ụzọ ebe mkpọaha ha na-arụgara aka, n’otu nkebi ahịrị okwu, na-esochi ha. Ọtụtụ ngwaa nọ n’ahịrị okwu nwere mmafenye asụsụ na-abụ ndị sitere n’asụsụ nke bụ isi, ma ọ bụ ndị yipuru njirimara asụsụ mgbakwụnye, mebe ka nke asụsụ bụ isi. Mgbe e nwere mmafenye asụsụ, odee/okwuu na-amalite n’otu asụsụ were nke abụọ mechie; mana ọ bụrụ ngwakọ asụsụ, e nwere ike iji nke ọbụla malite ma werekwa nke ọ bụla mechie. Ha na-abụ nka okwu asụsụ nye okwuu oge ụfọdụ n’ụfọdụ ebe.